Omah Lay
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Stanley |
aha ezinụlọ ya | Didia |
aha pseudonym | Omah Lay |
ụbọchị ọmụmụ ya | 19 Mee 1997 |
Ebe ọmụmụ | Port Harcourt |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
ọrụ ọ na-arụ | onye egwu, onye na-abụ abụ, odee egwu, producer |
ebe agụmakwụkwọ | University of Port Harcourt |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2019 |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
ngwa egwu | olu egwụ |
ụdị | Afrobeat, Afrobeats, R&B dị ugbu a |
akara ndekọ | Warner Music Group |
Ụdị onye si edozi ntụtụ ísí | Afro |
nnọchiaha nkeonwe | L485 |
Omah Lay, onye ezigbo aha ya bụ Stanley Omah Didia bụ onye na-agụ egwu, na-ede abụ, na-arụkwa ụda egwu. A mụrụ ya na Mee 19 1997. Ọ ghọrọ onye ama ama na 2020 mgbe egwu izizi ya “YOU” gbasara ngwa ngwa na ịntanetị. Ọ malitere dị ka onye na-emepụta egwu na onye na-ede egwú na Port Harcourt mana ọ mecha kpebie ịmalite ịgụ egwu mgbe ọ ghọtara na ya enwetaghị otuto zuru oke maka egwu ndị o nyere ndi ozo aka mepụta. Ọ mepụtara ma wepụta egwu dị ka "Do Not Disturb" na "Hello Brother" na obodo ya Port Harcourt nke meghere ya ụzọ ka ọ wee banye KeyQaad.[1]
Ndụ ya
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Omah Lay na Port Harcourt nime Southern Nigeria. Ọ tolitere na agbata obi nke Marine Base. Omah Lay agaghị abụ onye mbụ na-eme egwu na ezinụlọ ya. Nna nna ya bụ onye n'eti igba nke onye egwu Highlife nke nwụrụ anwụ, bụ Celestine Ukwu.[2]
Ọrụ egwu ya
[dezie | dezie ebe o si]Omah Lay banyere n'egwú dị ka onye rapper na agbata obi Marine Base. Aha ọkwa ya n’oge ahụ bụ Lil King. O mechara kpebie ịmụ otú e si emepụta egwú. O bu ụzọ gosi akara ya na egwu mgbe o mepụtara ọtụtụ egwu ndị wuru ewu na redio. Na May 22, Omah Lay wepụtara EP mbụ ya 'Get Layd' nke nwere egwu dịka “You” na “Bad Influence”.[3] EP ya rere nke ọma na ahịa. Ọ ghọrọ otu n'ime oba egwu Afrobeat kacha mma na ịntanetị wee gaa n'ihu ime Omah Lay Apple Music Favorite New Artiste nke ọnwa June na Africa.[4]
Na Septemba 2020, Omah Lay pụtara na egwu DJ Tunez "Pami" n'akụkụ Wizkid na Adekunle Gold.[5] N'otu ọnwa ahụ, Ọ weputara vidiyo egwu ya bụ “Damn”.[6]
Zoro aka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Esomnofu, Emmanuel. "Interview: Omah Lay Is Nigeria's New Young Act to Watch", OkayAfrica, 6 Julai 2020.
- ↑ Isaac, Michael. "SPOTLIGHT: Here’s Everything You Need To Know About Omah Lay", Information Nigeria, 30 Mee 2020.
- ↑ Anazia, Daniel. "Omah Lay… Nigeria’s rising star’s Get Layd on Apple Music", Guardian Newspaper, 11 Julai 2020.
- ↑ Eggertsen, Chris. "Apple Music Launches Africa Rising Artist Showcase with Debut Cover Star Omah Lay", Billboard.com, 2 Julai 2020.
- ↑ "How Blaisebeatz made ‘PAMI’ with Wizkid, Omah Lay, Adekunle Gold for DJ Tunez", Vanguard, 3 Septemba 2020.
- ↑ "Omah Lay out with ‘Damn’ video", PM News, 30 Septemba 2020.